A community helps one another escape rushing water as a small bird flies from an opened net

Abụ Ọma 124

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo,
2a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,
3mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ;
4idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị,
5ebili mmiri niile gaara ebufu anyị.
6Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị.
7Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.
8Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.

Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.