
Abụ Ọma 123
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe.
2Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje, otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere.
3Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.
4Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.
Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.