Nehemiah receiving news of Jerusalem's ruined walls before withdrawing in prayer at Susa

Nehemaya 1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Nke a bụ okwu Nehemaya nwa Hakalaya: Nʼọnwa Kislev, nke afọ ahụ mere ya iri afọ abụọ nke ọchịchị Ataksekses mgbe m nọ nʼụlọeze dị na Susa,
2otu nwanne m nwoke aha ya bụ Hanani, na ụfọdụ ndị ọzọ sitere Juda bịara ileta m. Ajụrụ m ha ajụjụ otu ihe si agara ndị Juu ahụ fọdụrụ, ndị si ebe dị iche iche lọta, jụọkwa ha maka Jerusalem.
3Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi Jerusalem; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.”
4Mgbe m nụrụ okwu ndị a, anọdụrụ m ala kwaa nnọọ akwa. Nʼezie, ajụrụ m iri ihe ọbụla ọtụtụ ụbọchị, nʼihi na eji m oge m niile kpee ekpere rịọ Chineke nke eluigwe arịrịọ,
5si ya: “Gị, Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, onye dị ukwu na onye dịkwa egwu; gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya nke ndị ahụ hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile. Biko nụrụ arịrịọ m.
6Leda anya ebere gị ka ị nụrụ arịrịọ mụ bụ ohu gị na-arịọ gị ehihie na nʼabalị. Ana m ekwupụta mmehie anyị bụ ụmụ Izrel, ma nke m na ezinaụlọ nna m mere megide gị.
7Anyị emela ihe jọrọ njọ megide gị. Anyị edebeghị iwu gị na ụkpụrụ gị nke i nyere ohu gị Mosis.
8“Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche.
9Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’
10“Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta.
11Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a. ” Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.

Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.