An elder advocates for poor families and children before wealthy, indifferent judges in an ancient court

Abụ Ọma 82

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu; ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile.
2Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? Sela
3Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi; hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha.
4Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa; napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume.
5Ha amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla. Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị; ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.
6“Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,” unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’
7Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ; unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.”
8O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe, nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.

Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.