Worshipers gather near the sanctuary as rain revives fields, streams, grain, and grazing flocks

Abụ Ọma 65

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn; ọ bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị,
2O gị onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,
3Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị, ị gbaghara anyị njehie anyị niile.
4Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara, ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị! E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị, mee ka afọ ju anyị.
5O Chineke, Onye nzọpụta anyị, i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị, ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa, na osimiri niile dị ebe dị anya,
6onye ji ike ya kpụọ ugwu niile, ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha,
7onye mere ka ụda olu oke osimiri niile na ụda olu ebili mmiri, na ọgbaaghara mba niile deere duu.
8Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile, nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada, ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ.
9Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri; ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma. Isi iyi Chineke adịghị ata ata, nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi, nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị.
10Ị na-eme ka mmiri jupụta nʼala a kọrọ akọ mee ka elu aja a kọrọ akọ dị larịị; ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro, na-agọzikwa ihe ndị akụnyere na ya.
11Ị na-eji owuwe ihe ubi bara ụba kpukwasị afọ ọbụla dịka okpueze, ụgbọ na-ebu ihe owuwe ubi na-ejubiga oke.
12Ala ebe ahịhịa na-epu nʼọzara na-ejupụta nʼahịhịa ndụ, e yikwasịrị ugwu niile obi ụtọ dịka uwe.
13E were igwe anụ ụlọ kpuchie nʼelu ala niile ebe ahịhịa dị ndụ puru, ọka kpuchikwara ndagwurugwu niile; ha na-eti mkpu ọṅụ na-abụkwa abụ.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.

Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.