A boastful official threatens a family while a faithful man stands beside a green olive tree

Abụ Ọma 52

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike? Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi, gị onye Chineke na-eleda anya?
2Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi; ọ dị ka agụba dị nkọ, gị onye na-ebi ndụ aghụghọ.
3Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma, ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. Sela
4O onye ire aghụghọ! Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya.
5Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị, ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. Sela
6Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu; ha ga-achị ya ọchị na-asị,
7“Ugbu a, lee nwoke ahụ, onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya. Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu. O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!”
8Ma adị m ka osisi oliv, nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke, nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
9Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere; aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ. Olileanya m ga-adị nʼime aha gị, nʼihi na aha gị dị mma.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.

Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.