
Abụ Ọma 47
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.
2Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.
3O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị; ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.
4Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị, ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela
5Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.
6Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.
7Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya.
8Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.
9Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala, dịka ndị Chineke nke Ebraham, nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke; ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.
Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.