
Abụ Ọma 4
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Zaa m mgbe m na-akpọku gị Chineke m, gị onye ezi omume; Napụta m site nʼihe mgbu m, meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.
2Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere? Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? Sela
3Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya; ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.
4Maanụ jijiji, unu emehiekwala; mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu; nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela
5Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu, chụkwaranụ ya aja ezi omume.
6Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?” Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị.
7Were ọṅụ mejupụta obi m karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.
8Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo, nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị, na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.
Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.