A violent thunderstorm breaks a cedar as worshipers watch safely from a stone sanctuary

Abụ Ọma 29

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya.
2Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya; kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.
3Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri; olu Chineke dị ebube na-ada ike ike, olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe nʼelu oke osimiri.
4Olu Onyenwe anyị dị ike, olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.
5Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida; Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.
6Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi, ọ na-eme ka Siriọn wulie elu dịka nwa atụ.
7Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe mgbe amụma na-egbu.
8Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji; Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.
9Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa. Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”
10Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri; Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
11Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike, ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.

Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.