Families embrace at a feast as oil is poured upon a priest before Mount Hermon

Abụ Ọma 133

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Lee ka o si bụrụ ihe dị mma na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!
2Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ, e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn, ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.
3Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn. Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya, ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.

Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.