
Abụ Ọma 131
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m, ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m; adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.
2Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ; dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ, e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.
3Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.
Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.