A tearful farmer sows near restored Jerusalem as joyful families return carrying abundant grain

Abụ Ọma 126

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn, anyị dị ka ndị na-arọ nrọ.
2Ọchị juru anyị ọnụ, abụ ọṅụ jukwara anyị ire. Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị, “Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.”
3Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ.
4Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị, dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev.
5Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ.
6Onye ji ịkwa akwa buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga, ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ, mgbe ha bu ukwu ọka ha.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.

Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.