
Abụ Ọma 120
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m, ọ na-azakwa m.
2O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ.
3Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ?
4Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere.
5Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda!
6Ogologo oge ka m binyere ndị kpọrọ udo asị.
7Abụ m onye udo; ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.
Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.