Bildad speaking beneath a vast night sky and dimmed moon

Job 25

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:
2“Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke; Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.
3Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ? Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?
4Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke? Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha?
5Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta, ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya,
6ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru, mmadụ, nke bụ naanị idide.”
‹ Job 24Job 26 ›

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.

Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.