
Aịzaya 20
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
1Nʼafọ ahụ, Sagọn, eze Asịrịa, zipụrụ ọchịagha onye ọkwa ya kasị ukwuu, ka ọ gaa buso Ashdọd agha. Ọ gara meriekwa ya nʼagha.
2Nʼoge ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ Aịzaya nwa Emọz. Ọ sịrị ya, “Yipụ uwe mkpe iyi nʼahụ, ya na akpụkpọụkwụ dị gị nʼụkwụ.” O mere otu a, ọ gbaara ọtọ, jegharịakwa nʼụkwụ efu.
3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Dị ka ohu m Aịzaya si gbara ọtọ jegharịa nʼụkwụ efu afọ atọ ndị a niile, ọ bụ ihe ama na ihe ịdọ aka na ntị na-egosi ihe gaje ịbịakwasị ndị Ijipt na ndị Kush.
4Nʼihi na otu a ka eze Asịrịa ga-esi kpụrụ ndị Ijipt na ndị Kush ọ dọtara nʼagha. Ha ga-agba ọtọ na-ejegharị nʼụkwụ efu, ma nwantakịrị ma okenye. Otule ha gba ọtọ ga-abụrụ Ijipt ihe ihere.
5Egwu ga-ejide ndị ahụ niile nwere nchekwube nʼike Kush, na ndị ahụ niile jiri Ijipt nyaa isi ga-ada mba. Ihere ga-emekwa ha.
6Nʼụbọchị ahụ, ndị ahụ dịnyeere ha, bụ ndị bi nʼọnụ mmiri ha ga-asị, ‘Ọ bụrụ na ihe dị otu a dakwasịrị ndị Ijipt anyị tụkwasịrị obi inyere anyị aka, na ịnapụta anyị site nʼaka eze Asịrịa, ebeekwanụ ka anyị ga-agbaga?’ ”
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ — CC BY-SA 4.0. Where these translations come from.
Copyright © 2020 by Biblica, Inc. Available free at biblica.com and open.bible. Text unchanged, used under CC BY-SA 4.0.